E chekata la m ihe m ga e kwu maka nwa amadi a aha ya bu Ronaldo de Lima, onu e kweghi m ikwu ihe o bula. Kedu nke a ga e kwu ghara ibe ya. Nwa no ofuma. Ihe o na a gba na ukwu di egwu. Ka o ihe ya na umu ada n'eme. Otu o bula e si kwu o ya,Ronaldo bu nna ndi egwu niile.
Nwa amadi a si na ala ndi egwu, Brazil, obodo Chukwu tere mmanu n'ihe gbasara asomumpi boolu. Ronaldo a gbaala boolu, nuo ya ka a kpuru a chia ma rie ya ka anu mbe. Nzuko boolu obula daputara mgbe o na a nu nko,onye o bula choro I hu ya n'ihu ogu. N'ozo di ka ibe ya,nwa amadi ahu na a nukwa nko n'onu. Mgbe onye egwu mgbe ochie bu Pele koro ya onu gbasara ibu ya,ihe o koro ya bu Pele mere onye nna ahu ka o je zoo n'ohia nkakwu. O ji onu dee ya ka akwa. Ka o si a gba n'ukwu bu ka o si a e kwu n'onu ma bukwara ka ya na ihe gbasara umu nwanyi si e me. Hiohiohiohio...a nwuola m n'ochi!..nwoke di nko...nwoke di njo ihe!
Ndi otu n'ahu maka egwuregwu boolu n'uwa niile gbaa gburugburu a na a kpo FIFA, ndi ojoo e ji wuruwuru wee mara turu ya ugo a na e to ndi egwu puru iche. Ka akuko si wee koo,Ronaldo nwere mgbe o buuru umu ato o huru ka umu ada wee lakpuo n'ime ulo ezumike. Mgbe o ruru na I ku aka,o huru na ndi o butere a bughi umu nwanyi! Ha niile bu umu nwoke! Kai! Nwa amadi a bere akwa ariri n'ihi na o kwuru ugwo enwe a kponye ya adaka. O fee n'isi ma kwuo ha ugwo ha a laa.
Na a gbanyeghi, Ronaldo,nna ndi egwu niile bu onye uwa niile na a kwanyere Ugwu. Site na ogbako egwu Inta Milan, ruo Madridi ma jeruo na ala Brazil,uwa niile na a kwanyere ya Ugwu.
Ka a na a kwado asomumpi iko mba uwa na ala Brazil, anyi niile na e chete ya bu onye egwu.
Na ngwucha, e ji m n'aka na o nweghi onye tabiri onu mgbe o na a gu ihe a. Ka Chineke chebe anyi niile...isee!
No comments:
Post a Comment